Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 22, 2026
Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 22, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Gọọmenti etiti etinyela mmachibido ime njem ụbọchị 21 n'isi mmadụ 46 ha na onye ahụ nwere ọrịa Ebola metụtara ahụ, ma gwa ụlọọrụ Nigeria Civil Aviation Authority ka ha hụ na e mezuru nke a.
- N'ozi si n'aka minista na-ahụ maka njem ụgbọelu na Nigeria bụ Festus Keyamo, mmadụ 44 bụ ndị ha na nwaayị ahụ nwere mmetụta n'ụlọọgwụ ndị ọ gara oge ọ malitere ịhụta njirimara Ebola, ebe abụọ ndị nke ọzọ bụ ndị ọrụ ya.
- Ụlọikpe ga-ezukọ taa maka ileba anya n'okwu ndị a na-enyo enyo na ọ bụ ha tọọrọ ndị ntoroọbịa 20 na-efe ala nna ha n'Imo state.
- A nwụchiri ndị ahụ a na-enyo enyo na Port Harcourt dị na Rivers state nakwa n'Abia state oge ndị ọrụ nchekwa DSS, ndịagha, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ jikọtara aka rụọ ọrụ n'ụbọchị 10 ruo n'ụbọchị 14 Ọktoba, 2026.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






