Akụkọ dị mkpa - Ọgọst 28, 2026

Aha onyonyo, Akụkọ dị mkpa - Ọgọst 28, 2026
Akụkọ dị mkpa - Ọgọst 28, 2026
Mgbe e biputara ya

Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:

  • Ndị uweojii ekwuola na ha azọpụtala mmadụ iri na otu nke gụnyere ndị na-efe ala nna ha a maghị olee ha dị nke ndị ojiegbe tọọrọ n'okporoụzọ si Aloma aga Egane n'okpuruọchịchị Ofu dị na Kogi steeti.
  • N'ọzọ yiri ya, Ndịagha Naịjirịa kwuru na ha egbuola ndị na-eyi ọha egwu karịrị mmadụ iri abụọ nke otu Boko Haram na ISWAP oge ha wakporo mpaghara ugwu Kopre dị n'okpuruọchịchị Hong nke Adamawa steeti.
  • Atiku Abubakar ji ọkọlọtọ African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa onyeisiala ekwuola na ya ga-eji otu afọ kwụsị ọnọdụ nchekwa adịghị mma ma o weghaara ọchịchị dịka Onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2027.
  • Chọpụta ihe ndị ọzọ o kwuru na mkparịtaụka pụrụiche anyị na ya nwere na webụsatị anyị.

Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.

Foto e dere Akụkọ dị mkpa
Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
BBC IGBO
Nkọwa foto, Whatsapp Chanelu BBC IGBO