'Onye ọbụla na-achọghị iso mee ntuliaka 2027 bụ onye iro ndị Igbo'

Aha onyonyo, 'Onye ọbụla na-achọghị iso mee ntuliaka 2027 bụ onye iro ndị Igbo'
'Onye ọbụla na-achọghị iso mee ntuliaka 2027 bụ onye iro ndị Igbo'
Mgbe e biputara ya

Otu na-akpọ oku maka nnwereonwe Bịafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) aṅụọla iyi na ha agaghị eso mee ntuliaka afọ 2027 na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ma ọ bụrụ na Gọọmenti Naịjirịa etinyeghị ụbọchị a ga-amalite ikpe onye ndu ha a tụrụ mkpọrọ bụ Nnamdi Kanu. Ha nyere gọọmenti izuụka abụọ iji mee nke a.

Ọnụ na-ekwuchitere Ipob bụ Emma Powerful kwuru na ndị otu ha nwere mkpebi a n'ihi nchegbu ndị ezinaụlọ Nnamdi Kanu na-enwe gbasara oge a na-egbu ileba anya n'akwụkwọ Kanu gbara n'Ụlọikpe Mkpegharị megide nga mkpụrụọka Ulọikpe Ukwu dị n'Abuja tụrụ ya.

Emma Powerful sịrị na Nnamdi Kanu edegarala Nnukwu Ọkaikpe Naịjirịa akwụkwọ ka a gbapụ ọsọ leba anya n'ikpe ya ma boo ebubo na Gọọmenti Naịjirịa achọghị ịpụta n'ụlọikpe kemgbe ahụ a mara Kanu ikpe.

Ipob katọkwara mkpebi Ụlọikpe Kachasị, bụ ndị tụgharịrị nchabi ikpe nke Ụlọikpe Mkpegharị, bụ ndị gwara Nnamdi Kanu lawa na ikpe amaghị ya n'ebubo niile gọọmenti boro ya n'ọnwa Ọktoba 2022.

Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ tinyere ọnụ n'okwu a.

Rev. Okechukwu Obioha bụ onyendu otu Njikọ Igbo, nke o kwuru bụ otu ngalaba Ọhanaeze Ndigbo gwara anyị na o nweghị ihe ga-eme ka a ghara ime ntuliaka na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, dịka ọ kọwara onye ọbụla na-eme atụmatụ iwezuga onwe ya na ntuliaka afọ 2027 dịka onye iro nke ndị Igbo.

"Mmadụ ọbụla maọbụ otu ọbụla na-ekwu ka ndị mmadụ ghara ịpụta n'oge ntuliaka nke Naịjirịa bụ onye iro ndị Igbo, okwu ahụ abụghị eziokwu. Onye ahụ achọghịdị nnwereonwe anyị. A ga-eme ntuliaka na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ niile. Ka onye niile leghara okwu ahụ anya."

Rev Obioha kwuru na ọ dị mkpa na ndị Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa pụtara n'igwe n'oge ntuliaka iji họpụta onye ga-emezu ebumnobi ndị Igbo nakwa Naịjirịa n'ozuzuke.

"A na-akpagbu mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kemgbe afọ 1970 a lụchara agha ruo ugbua ma Nnamdi Kanu na-ekwu ka a kwụsị mkpagbu ahụ a na-akpagbu ndị Igbo. O nweghị ihe Nnamdi Kanu mere, aka ya dị ọcha. Ụlọikpe Kachasị ekwuola na o nweghị ihe o mere ma sị ka a tọhapụ ya, mana a ka jichiri ya".

"Ndụmọdụ m na-enye onye ọbụla kwuru ihe a m kọwara dịka onye iro ndị Igbo bụ na mbe nọ n'ime olulu mposi afọ asaa mana ka ọ fọdụrụ naanị mkpụrụ ụbọchị asaa ka ọ pụta, o tiwe na nsị esigbuola ya. Ugbua ohere pụtara, anyị ga-eji ya mee ihe. A ga-ahazi ntuliaka n'ozuzuoke."

Mana ihe abụghị oge mbụ Ipob na-akpọ oku ka a ghara ime ntuliaka na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

N'afọ 2023, ngalaba Ipob nke Simon Ekpa nọ n'isi ya kwupụtara na agaghị eme ntuliaka na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, dịka ọ sịrị na nke ahụ bụ ụzọ ha chọrọ iji ịkwanye Gọọmenti Naịjirịa ọkụ n'ahụ ịtọhapụ onyendu ha e ji eji bụ Nnamdi Kanu.

Ọzọkwa, n'afọ 2021 ka Ipob yiri egwu ịkwụsị ntuliaka gọvanọ Anambra Steeti, dịka ha kwuru na ntuliaka ahụ agaghị enwe isi ruo mgbe Gọọmenti Naịjirịa ga-aza oku ha na-akpọ ka a hazie ntuliaka 'referendum'.

N'afọ 2019, Nnamdi Kanu n'onwe ya kwuru na ntuliaka agaghị enwe isi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. O kwuru na nke ahụ bụ akụkọ ụzọ Ipob ji na-akpọ oku ka a hazie ntuliaka 'referendum' ma nyekwa ha nnwereonwe.

Mana otu ihe a na-ahụtakarị n'oku niile ndị a bụ na Ipob na-emecha kagbuo mkpebi ha ịkụsasị ntuliaka ma ọ fọdụ mkpụrụ ụbọchị ole na ole ka a hazie ntuliaka, bụ nke na-etinye ụfọdụ ndị otu ha na gbalụ gbalụ n'ihi na ha enwetaghị akwụkwọ e ji eme ntuliaka bụ voter card n'asụsụ Bekee.