Rabiu Kankwanso: Ugwu na Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa kwesịrị ịgbaghara onwe ha

- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Abba Auwalu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Chinonso Nnachi
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Onye so Peter Obi azọ ọkwa ọchịchị dịka Osote Onyeisiala na ntuliaka 2027 n'aha otu NDC bụ Rabiu Kwankwaso akpọọla oku ka ndị Ugwu na ndị Ọwụwa Anyanwụ gbaghara onwe ha ma jikọọ aka maka ọdịmma Naịjiria.
Kwakwaso onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere an snosno a kwuru na Ugwu Naijiria na Ọwụwa Anyanwụ bụ enyi kemgbe malite n'oe Nnamdi Azikiwe.
Ọ sịrị, "Anyị kwenyere na Ọwụwa Anyanwụ bụ ndị enyi anyị kemgbe. N'ọchịchị ndị nkịtị mbụ, NPC bụ pati ndị Ugwu na NCNC nke Nnamdi Azikwe bụ onye ndu ha nwere nkwekọrịta. Ọbụladị n'agba nke abụọ nke ọchịchị ndị nkịtị, Shagari na ndị otu ya na ndị Ọwụwa anyanwụ nwere nkwekọrịta."
Aka chịburu Kano steeti gara n'ihu sị, "Anyị agaghị anọ n;out obodo na-ebu onwe anyị agha. Anyị kwesịrị inwe mmụọ ịgbaghara onye ọbụla mejọrọ anyị."



