Spain anabatala ndị mbịambịa Aquarius ajụrụ ajụ

Ebe foto si, EPA
Ọdọ ụgbọ mmiri Valencia dị na mba Spain anabatala ụgbọ mmiri nke mbụ bụ ndị mbịambịa azọpụtara na mmiri Mediterranean.
Ndị mbiambia a bụkwa ndị a ndị Italy na Malta jụrụ ị nabata n'izu ụka garaga.
Ụgbọ nke mbụ a so n'ụgbọ atọ bu ndị mbịambia batara ka chi fochara, bu mmadụ ruru narị isii, iri abụọ na itoolu azọpụtara na Libya n'ime ụgbọ Aquarius.
Ndị ọrụ ahụike na ndị ntapị nọ ya inye ha nkwado.
Gọọmentị banyere ọhụrụ n'ọchịchị na mba Spain ekwela nkwa iweta ahụike na-anaghị ego ma kwukwa na ọ ga-enyocha ọnọdụ ndị a chọrọ nchekwa.
Praim minista obodo ahụ bụ Pedro Sánchez kwuru n'izu ụka garaga,''ọ bụ ọrụ anyị inyereaka igbochi nsogbu na-emetuta ndụ mmadụ ma nye ha nchekwa.
Kamgbe ọ batara n'ọchịchị ọ nabatara ihe ọ bụla ga-enyere ndị mbiambia aka.

Ebe foto si, Reuters
Kedụ ihe ọnọdụ a putara?
Ụgbọ mmiri Aquarius butere esemokwu n'etiti mba na mba maka etu esi gbahapụ ndị mbịambia nọ n'ime mmiri ya n'ụbọchị anọ ọnwa Juunu.
Cheta na ndị ọchịchị Italy jụrụ ya bụ ụgbọ mmiri ị kwọsa ndị mbiambia o bu n'ala ha.
Ọ yọrọ ka mba Malta nabata Aquarius ,mana Malta jụrụ, na-adọ ndọrọndọrọ na ọ bụ Italy kwesiri ị nabata ha.
Ihe gbasara ndị mbịambia nwekwara ike iso n'isiokwu ndị isi ọchịchị Yuropu ga-elebaanya na nzukọ ha ga-eme na ngwucha ọnwa Juunu.




























