Harry Kane eturula ugo 'Ballon d'Or' afọ 2026

Harry Kane eturula ugo 'Ballon d'Or' afọ 2026
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Harry Kane mba England eturula ugo 'Ballon d'Or' afọ 2026.

Kane meriri Yamine Lamal mba Spain na Kylian Mbappe mba France iji turuugo ahụ.

Nke a bụ oge mbụ onye mba England na-erite Ballon d'Or kemgbe afọ 25 gara aga.

Alexia Putellas mba Spain ritere onyinye Ballon d'Or nke ụmụnwaanyị. Putellas na-agbara otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị Barcelona bọọlụ.

Ndị ọzọ ritere Onyinye na mmemme onyinye ahụ e mere na London n'abalị Mọnde 26 Ọktoba 2026 gụnyere Luis de la Fuente mba Spain onye ritere onyinye onye nkụzi otu egwụ bọọlụ ụmụnwoke kachasị n'ụwa.

Foto Alexia Putellas oge o ji onyinye Ballon d'Or o ritere

Lamine Yamal ritere onyinye 'young talent of the year'. Nke a bụ ugboro atọ ọ na-erite Onyinye a.

Unai Simón mba Spain bụ onye ritere onyinye ochee goolu kachasị n'ụwa

Bukayo Saka ritere onyinye 'Socrates Award'.

Onyinye otu egwu bọọlụ kachasị bụ Paris Saint-Germain ritere ya.

Luis de la Fuente, Lamine Yamala na Unai Simón oge ha ji onyinye ha ritere
Oge Dembela bịara nara onyinye otu egwu bọọlụ ya PSG ritere

Charlyn Corral mba Mexico ritere onyinye onye goolu kachasị n'asọmpi ụmụnwaanyị ebe Harry Kane mba England ritere onyinye onye goolu kachasị n'asọmpi ụmụnwoke.

Charlyn Corral mba Mexico ritere onyinye onye goolu kachasị n'asọmpi ụmụnwaanyị ebe Harry Kane mba England ritere onyinye onye goolu kachasị n'asọmpi ụmụnwoke.

Harry Kane, Mbappe, maọbụ Lamine Yamal nwereike ịbụ ọkacha agba bọọlụ Ballon d'Or 2026

Kylian Mbappe, Lamine Yamal na Harry Kane

Kylian Mbappe, Lamine Yamal na Harry Kane bụ mmadụ atọ nwereike ituru ugo Ballon d'Or 2026.

Ballon d'Or bụ ihe nrite a na-enye ndị kacha agba bọọlụ n'ụwa nke bidoro kemgbe afọ ịrị asaa gara aga na mba France.

Ọ bụ ụlọmgbasa ozi a kpọrọ 'France Football Magazine' na ngalaba egwuregwu bọọlụ na mba France bidoro emume ahụ iji akwanyere ndị kacha agba bọọlụ ugwu.

Ha na-enye ma ndị ọgbaa bọọlụ nwoke nakwa ndị nwaanyị ihe nrite ahụ.

Kemgbe afọ 1956 ka 'France Football Magazine' bidoro ihe nrite ahụ nke ha na-eme kwa afọ ọbụla.

N'ihe nrite nke afọ, ọtụtụ ndị a ma ama n'Europe, America nakwa Africa so na ndị a họpụtara ga-eso zọọ onye a ga-enye ọkacha ọgbaa bọọlụ Ballon d'Or nke afọ.

Kedụ oge na ebe a na-eme Ballon d'Or nke afọ 2026?

Aitana Bonmati and Ousmane Dembele buru Ballon d'Or ụmụnwaanyị na nke ụmụnwoke n'afọ 2025

Ballon d'Or afọ 2026 were ihe nrite 13, mana o nwere abụọ ka ibe ha.

A ga-eme Ballon d'Or nke afọ 2026 n'ụbọchị Monde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa October 2026.

Ebe a ga-eme ya bụ na Palladium Theatre dị na London n'elekere itoolu nke mgbede.

Nke a bụ nke mbụ a na-eme ya na London.

Otu jikọrọ ndị egwu bọọlụ na Europe bụ UEFA kwuru na ha ji nke ahụ na-akwanyere nwafọ mba England bụ Stanley Matthews ugwu.

Stanley Matthews bụ onye nwetere ihe nrite ahụ n'afọ 1956.

Cheta na ọ bụ na mba France ka a kacha eme emume nkwanyere ugwu Ballon d'Or. Emeela ya na Paris Theatre du Chatelet kemgbe afọ 2019.

Kedụ oge ikpeazụ nwaafọ Africa ritere nkwanyeugwu a?

George Weah nwaafọ mba Liberia butere Ballon d'Or nke ụmụnwoke n'afọ 1995, afọ.
Nkọwa foto, George Weah

N'afọ 1995, ka George Weah nke mba Liberia ritere Ballon d'Or nke ụmụnwoke.

Kemgbe ahụ, o nwebeghị onye si mpaghara Africa na-agba bọọlụ na mbaụwa ritere nkwanye ugwu ahụ.

Ọ bụ eziokwu na mmadụ ole na ole n'ime ha anwaala ka ha detụ ya ire.

Sadio Mané nke mba Senegal gbara onye nke abụọ n'afọ 2022 ebe Mohamed Salah gbara onye nke anọ n'afọ 2025.

Ndị nwereike iburu Ballon D'or nke n'afọ 2026 na obodo ha si

Ndị a na-enye ihe nrite ọkacha ọgba bọọlụ Ballon d'Or bụ ndị gbaara mba ha nakwa otu egwuruegwu bọọlụ ha na-agbara bọọlụ nke ọma.

E kwuru na nturugo n'Iko Mbaụwa nke afọ 2026 nke mba Spain turu so n'ihe ga-enyere ụmụafọ mba Spain mmadụ isii so na ndị na-azọ ihe nrite Ballon d'Or nke afọ a, aka.

Mana ọ bụ etu ndị ọzọ dịka Harry Kane, Kylian Mbappe na Erling Haaland na-abụghị ndị Spain, si gbaara otu egwuregwu bọọlụ ga-abụ ihe ga-enyere ha aka.

Ndị niile a na-atụanya nwereike iburu ihe nrite ahụ gunyere:

  • Lionel Messi (Inter Miami/Argentina)
  • Erling Haaland (Man City/Norway)
  • Jude Bellingham (Real Madrid/England)
  • Pau Cubarsi (Barcelona/Spain)
  • Marc Cucurella (Real Madrid/Spain)
  • Ousmane Dembele (Paris St-Germain/France)
  • Luis Diaz (Bayern Munich/Colombia)
  • Bruno Fernandes (Manchester United/Portugal)
  • Gabriel (Arsenal/Brazil)
  • Erling Haaland (Manchester City/Norway)
  • Achraf Hakimi (Paris St-Germain/Morocco)
  • Harry Kane (Bayern Munich/England)
  • Khvicha Kvaratskhelia (Paris St-Germain/Georgia)
  • Lamine Yamal (Barcelona/Spain)
  • Sadio Mane (Al-Nassr/Senegal)
  • Marquinhos (Paris St-Germain/Brazil)
  • Lautaro Martinez (Inter Milan/Argentina)
  • Kylian Mbappe (Real Madrid/France)
  • Nuno Mendes (Paris St-Germain/Portugal)
  • Lionel Messi (Inter Miami/Argentina)
  • Joao Neves (Paris St-Germain/Portugal)
  • Michael Olise (Bayern Munich/France)
  • Willian Pacho (Paris St-Germain/Ecuador)
  • Julian Quinones (Al-Qadsiah/Mexico)
  • Declan Rice (Arsenal/England)
  • Rodri (Barcelona/Spain)
  • Fabian Ruiz (Paris St-Germain/Spain)
  • William Saliba (Arsenal/France)
  • Ferran Torres (Paris St-Germain/Spain)
  • Dayot Upamecano (Bayern Munich/France)
  • Vinicius Jr (Real Madrid/Brazil)
  • Vitinha (Paris St-Germain/Portugal)
Sadio Mane na onye ọzọ.

Ajụjụ onye ọbụla na-ajụ ugbua bụ onye ga-enwe ohere iburu ihe nrite Ballon d'Or nke afọ a? Ọzọ bụ kedụ nke ga-eru ụmụ Africa aka?

Sadio Mane na-agbara otu egwu bọọlụ Al-Nassr ma bụrụ nwaafọ mba Senegal alọghachila n'ihu akwụkwọ ndị na-azọ Ballon d'Or, tinyere Achraf Hakimi nke mba Morocco.

Mana ndị mba ọzọ na-azọ ihe nrite ahụ gunyere Lamine Yamal, Kylian Mbappé na Harry Kane.

N'ụbọchị 26 Ọktoba, ndị ntaakụkọ egwuruegwu bọọlụ ụkwụ na mbaụwa ga-anọ na London kpebiere onwe ha. Ndị Africa anọ ka a họpụtara maka onyinye nkwanyeugwu abụọ ndị ahụ kachasị. 2026, o nwereike ịbụ afọ ga-agbanwe ọnọdụ ihe si kwụrụ?