Mee nu nnyocha maka ihe gburu nwanne anyị - Ezinaụlọ Okorite

Mee nu nnyocha maka ihe gburu nwanne anyị - Ezinaụlọ Okorite
Mgbe e biputara ya

Onwu Okorite Charles, dị afọ iri abụọ na otu n'ulo oriri na nkwari bu akụkọ na-agbanwa obi.

Ezinaụlọ ya kwuru na ọ nwụrụ n'ụlọ oriri na nkwari dị na Pọtakọ, Rivas steeti.

Ha sị na ọdachị ahụ mere n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Ọgọst 2026.

Dịka ha si kwuo, ihe na-agbanwa ha obi bụ na-enweghị onye na-enye ha ezigbo nkọwa banyere ihe gburu nwa ha.

Ụnụnne Okorite Charlse na-arịọ ka a gbatara ha ọsọ enyemụaka.

Onye ntaakụkụ gara n'ebe ihe ahụ mere kwụrụ na ụlọ oriri na nkwari ahụ mechiri emechi dịka ahịa adịghịzị azụ n'ime ya, mana mbọ niile ọ gbara ka ndị nwe ya maọbụ ndị ọrụ n'ebe ahụ gwa ya okwu amịtaghị ezi mkpụrụ.

N'otu aka ahụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rịvas steeti bụ Blessing Agave azaghị oku niile BBC kpọrọ ya n'ekwe ntị maọbụ zaa ajụjụ a jụrụ ya banyere ọnwụ nwatakịrị a.