You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa - Ọgọst 31, 2026
Akụkọ dị mkpa - Ọgọst 31, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu emeela mkpesa n'otu jikọtara mba Afrịka bụ Afrịcan Union maka mwakpo a na-eme ụmụafọ Naịjirịa nakwa ndị Afrịka ndị ọzọ na mba Saụt Afrịka.
- O mere nke a n'ọgbakọ pụrụiche nke otu ahụ nwere na mba Angola nke Osote Onyeisiala bụ Kashim Shettima nọchiri anya ya ma kwuo na mwakpo ndị a megidere ịdịnotu mba Afrịka.
- Ndị uweojii Anambra Steeti akatọọla ogbugbu e gburu mmadụ abụọ gụnyere onye ọma ọkwa a ma ama n'Awka bụ Isaac Nwosu bụ ndị amaghị ndị ha bụ gbagburu na mgbede Sọnde abalị iri atọ nke ọnwa Ọgọst 2026.
- Ndị uweojii ṅụrụ iyi na ha ga-esi imi n'ala ịchọpụta ndị oji egbe ahụ kpara arụ a ma rịọ ka ndị ọha nyere ndị uweojii site n'ịgba ama ga-enye aka ijide ndị a.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.