Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 23, 2026

Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 23, 2026
Mgbe e biputara ya

Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:

  • Ụlọomeiwu Steeti iri abụọ na anọ n'ime steeti iri atọ na isii Nigeria were ebinyela aka ma kwado iwu ihiwe ụlọọrụ ndị uweojii nke steeti a kpọrọ 'State Police".
  • Femi Gbajabiamila bụ onyeisi 'Presidential Working Group' nke Onyeisiala Bola Tinubu hiwere maka iguzobe ụlọọrụ ndị Uweojii steeti mere ka a mata nke a ma kelee ndị niile kwadoro ya.
  • Mba France ewkupụtala na ha achọpụtala otu onye bu ọrịa Shamonda virus.
  • Shamonda virus a bụ ọrịa e kwuru na a na-ahụkarị n'ụmụanụmanụ dịka ewu, atụrụ, ehi nakwa ịyịnya.
  • Ozi Tedros Adhanom Ghebreyesus bụ onyeisi ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) wepụtara n'akara X ya n'ụbọchị Tọzde 22 Ọktoba 2026, kwuru na a chọpụtara onye bu ọrịa Shamonda virus ahụ na mpaghara ọrịa ahụ na-efesa n'anụmanụ na mba France.

Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.