Ọnwụ Tupac Shakur: A maala "Keffe D" Davis, onye bụbu onye ndu ndị otu nzuzo ikpe

Aha onyonyo, Ụlọikpe Amerịka mara 'Keffe D' ikpe maka ịkpa nkata gbuo Tupac
    • Onye dere ya, Anoushka Mutanda-Dougherty
    • Ndị mere akụkọ a, in the Las Vegas court
    • Onye dere ya, Christal Hayes
    • Onye dere ya, Shaimaa Khalil
    • Onye dere ya, Regan Morris
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Duane Davis n'ime ụlọikpe dị na Las Vegas

Ebe foto si, STEVE MARCUS / POOL / AFP via Getty Images

Nkọwa foto, Duane Davis n'ime ụlọikpe dị na Las Vegas

Afọ iri atọ agaala kamgbe a na-atụ anya ịmata onye gbagburu otiegwu a ma ama bụ Tupac Shakur, mana ugbua, a maala onye bụbu onyendu otu ndị omekome South Side Compton Crips, bụ Duane "Keffe D" Davis, ikpe maka igbu ya.

E gburu Tupac n'afọ 1996 n'oge e si n'ime ụgbọala na-agbafe agbafe gbaa ya egbe, mana enweghị onye e jidere ruo n'afọ 2023, mgbe e boro Davis ebubo igbu ọchụ a na-atụghị anya ya.

N'ime izu ole na ole gara aga, ikpe ahụ a na-ekpe na Las Vegas lekwasịrị anya n'akwụkwọ ncheta (memoir) Davis bipụtara n'afọ 2019, ebe o dere na ọ bụ ya nyere ngwaagha e ji gbuo Tupac.

Davis na onye Ọkaiwu ya kwuru na ihe ndị ahụ bụ akụkọ ifo na ịnya isi e dere iji mee ka akwụkwọ ahụ ree nke ọma, mana ndị Ọkaikpe wepụtara mkpebi na aka ya dị ọnwụ Tupac.

Dịka Shaimaa Khalil, onye ntaakụkọ BBC News maka Nọt Amerịka si dee, akụkọ Davis n'onwe ya banyere ihe mere n'ikpeazụ bụụrụ ihe kpatara e ji maa ya ikpe.

Etu ọ dị, nke a nwereike ọ gaghị abụ njedebe nke akụkọ a.

Mgbe a gụchara okwu mmechi nke ndị Ọkaiwu n'ụlọikpe, onye bụbu onyeisi otu ndị omempụ ahụ gwara ụlọikpe na ọ ga-arịọ ka e nyochaa ikpe ahụ ọzọ.

Ndị enyi Shakur na ndị ezinaụlọ ya na-aṅụrị ọṅụ maka ikpe a mara Davis

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị enyi Shakur na ndị ezinaụlọ ya na-aṅụrị ọṅụ maka ikpe a mara Davis

Tupac Shakur dị afọ iri abụọ na ise oge e gburu ya, mgbe akaraaka ya na-achawapụta dịka onye na-eti egwu ntabiire 'rap'. O reela ihe karịrị egwu nde iri asaa na ise gburugburu ụwa.

Ndị Ọkaiwu esiela arụmarụ oge a na-ekpe ikpe ahụ na ọ bụ eziokwu na Davis, onye bụbu onyendu otu ndị omekome a kpọro 'South Side Compton Crips' a gbapụghị mgbọ egbe gburu Shakur, o nyere iwu ka a gbapụ mgbọ egbe ahụ ma zụtakwa egbe nwa nwanne ya bụ Orlando Anderson jiri kwaa mgbọ ahụ.

Ha gwara ụlọikpe na Davis kpara nkata ịkwa mgbọ ahụ dịka ụzọ o si emegwara maka ọgụ Anderson na Shakur na ndị egwu ya lụrụ na Las Vegas na mmalite ụbọchị ahụ.

N'ime afọ iri atọ, okwu a agaala n'ihu bụrụ otu n'ime ikpe ndị jụrụ oyi a ma ama, nke kpalitere ọtụtụ ịkpa nkata, nke na-abụghị amamikpe ruo ugbua.

E gburu Shakur n'oge ndị na-eti egwu ntabiire 'rap' na mpaghara East Coast na West Coast na-alụrịta ọgụ nakwa oge e nwere ọgbaaghara n'etiti ndị otu Bloods na Crips, nke gbanyere mgbọrogwụ n'egwu agbantịrọ bụ 'hip-hop' n'oge ahụ.

Oge e kpechara ikpe ahụ, a hụrụ ka ndị ji obi ha niile na-akwado Tupac Shakur na-ebe akwa ma na-etikwa mkpu ọṅụ.

Foto e sere n’afọ 1996 nke onye na-abụ rap Tupac Shakur (n’aka ekpe) na Marion “Suge” Knight, nke e gosiri n’oge ikpe igbu ọchụ ahụ.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Foto e sere n'afọ 1996 nke onye na-abụ rap Tupac Shakur (n'aka ekpe) na Marion "Suge" Knight, nke e gosiri n'oge ikpe igbu ọchụ ahụ.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Otu ihe akaebe gbara ọkpụrụkpụ n'ikpe ahụ bụ okwu ọnụ Davis, ebe o kwupụtara ugboro ugboro ma nọrọkwa n'ọha kweta na ya nọ n'ime ụgbọala Cadillac ọcha e si na ya gbapụ mgbọ egbe ọjọọ ndị ahụ.

Ọ gwara ndị ọchịchị gbasara ntụnye ya n'ọnwụ Shakur oge ndị uweojii gbara ya ajụjụ na nzuzo gbasara ọnwụ onye otu ya na-eti egwu ntabiire bụ Notorious B.I.G, onye ezigbo aha ya bụ Christopher Wallace.

Davis nyekwuru nkọwa gbasara ntụnye ya n'ọnwụ Tupac Shakur n'akwụkwọ o dere n'afọ 2019, nke ọ kpọrọ Compton Street Legend.

N'oge niile e kpere ikpe ahụ, ndị na-ekwuchitere Davis gbara mbọ ime ka ndị Ọkaiwu kweta na okwu ndị ahụ o kwuru abụghị ihe mere eme, kama ha bụ nke o ji etu ọnụ iji nwee ike ree akwụkwọ ma nweta ego.

N'okwu mmechi ya, Ọkaiwu Davis bụ Michael Sanft gwara ndị Ọkaiwu ka ha leghara okwu ndị ahụ Davis kwuru anya ma hụta ya dịka onye okwu ụgha, onye kọrọ akụkọ ifo iji nweeike ree akwụkwọ.

Mana n'ime awa ole na ole ndị Ọkaiwu nwetara ikpe ahụ n'ụbọchị Mọnde, ha kwetara na aka Davis dị n'ọnwụ Tupac Shakur.

Tupu mmadụ niile apụọ n'ụlọikpe, Ọkaiwu nke ụlọikpe Clark County District Court bụ Carli Kierny kwupụtara 13 Ọktoba dịka ụbọchị a ga-ama Davis ikpe.