Ebola: Ọnọdụ nwaanyị bu ọrịa a na Nigeria na-adị mma - Minista ahụike

Foto Ali Pate bụ minista ahụike Nigeria nakwa ihe ngosi ọbara bu Ebola
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Minista na-ahụ maka ahụike na Nigeria bụ Mohammed Ali Pate ekwuola na ọnọdụ ahụike nwaanyị ahụ e kwuru na o bu ọrịa Ebola bata n'Abuja n'ụbọchị Tuzde 20 Ọktoba 2026, na-akawanye mma dịka ọ na-enweta nleta n'ogige ọ nọ naanị ya.

Ali Pate kwuru nke a na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC nwere ma kọwaa na nwaanyị ahụ dị afọ 42 bi n'Abuja mana ọ bụghị onye Nigeria.

Cheta na mba Uganda wepụtara ozi ma kwuo na nwaanyị ahụ bụ nwaafọ mba Nigeria.

Pate gwara anyị na nwaanyị ahụ batara Abuja n'ụbọchị Satọde 3 Ọktoba 2026 dịka ọ nọrọ izuụka abụọ na ọkara n'isiobodo mba Uganda bụ Kampala. O kwuru na nwaanyị ahụ mere njem n'isiobodo mba Ethiopia bụ Addis Ababa tupu ọ bata Nigeria.

Ọ gara n'ihu kwuo na nwaanyị ahụ apụbeghị na Nigeria kemgbe ọ batara Nigeria ma kọwaa na nwaanyị ahụ anaghị egosi njirimara ọrịa Ebola oge ya na ya nwere mkparịtaụka n'ekwentị.

Pate kwuru na ihe dị mkpa ugbua abụghị akụkọ banyere ebe nwaanyị si kama na ọ bụ ichepụta usoro iji gbochie ọrịa Ebola ahụ ifesa na Nigeria.

O kwuru na ụlọọrụ na-ebu agha megide nfesa ọrịa na Nigeria, Ethiopia nakwa Uganda ejikọọla aka iji gbochie nfesa ọrịa a.

Ụlọomeiwu Sinetị na-achọ ego mberede maka ọrịa Ebola

Ụlọomeiwu Sineti na Nigeria akpọọla oku ka e wepụta ego mberede ozugbo iji kwalite mbọ mba ahụ na-agba iji lụso ọrịa Ebola ọgụ, dịka ụjọ ibute ọrịa ahụ na-amalite ịgbanwe omume ndị mmadụ n'obodo, kemgbe otu onye butere ọrịa ahụ n'Abuja.

Ndị Sineti gwara gọọmenti ka ha wepụta ego mberede site na ego 'Service Wide Vote' iji kwalite nlekota ọrịa, ịchọpụta ndị mmadụ nwere ọrị ahụ na igbochi ya, kama ichere ka e nye ha ego mmefu ego akwadoro.

Sinetọ Adamu Aliero nke Kebbi Central kwuru na ọnọdụ ahụ chọrọ enyemaka ozugbo iji gbochie nfesa nke nje ahụ.

Onyeisioche ụlọomeiwu Sinetị bụ Godswill Akpabio, kwupụtara na Wenezde na ọtụtụ ndị omeiwu jụrụ iji aka kelee ya n'ihi nchegbu na-arịwanye elu gbasara ntiwapụ nke ọrịa ahụ.

Nke a na-egosi etu okwu gbasara ọrịa Ebola si malite inwe mmetụta na mmekọrịta mmadụ na ibe ya kwa ụbọchị, karịsịa n'etiti ndị ọrụ gọọmentị.

Ndị omeiwu Sineti kwadokwara ime nnyocha ahụike nke iwu kwadoro maka ndị niile si mba ọzọ bata Nigeria na ọdọụgbọelu, ọdọụgbọmmiri na okeala n'agbanyeghị mba onye ahụ si abata Nigeria.

Ihe ndị a tụrụ aro gụnyere akwụkwọ nkwupụta ahụike, nlele okpomọkụ ahụ mmadụ na nnyocha ihe mgbaama, yana nnyocha ka mma maka ndị njem gara ma ọ bụ gafere mpaghara ndị butere ọrịa ahụ n'ime ụbọchị iri abụọ na otu gara aga.

Mba ebe ndị Ebola na-akpa batarala
Nkọwa foto, Maapụ na-egosi mba ebe ndị a chọpụtarala ọrịa Ebola

Bundibugyo Ebola Virus Disease: WHO ekpugheela ụdịrị ọrịa Ebola pụrụiche batara na Nigeria

Ndị ọrụ ahụike yi uwe nchekwa megide ọrịa Ebola

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na Nigeria bụ Muhammad Ali Pate ekwuola na a chọpụtala na otu onye bu ọrịa Ebola n'Abuja.

Ozi Pate wepụtara na Tuzde 20 Ọktoba kwuru na a malaitela ime nnyocha ma kwuo na ha achọpụtala mmadụ 44 e kwuru na ha na onye ahụ bu ọrịa ahụ nwere mmetụta iji hụ na-egochiri ọrịa ahụ ifesa na Nigeria.

Ali Pate kwuru na ọ bụ otu nwaanyị ji ụgbọelu si mba Uganda bata Nigeria bubatara ọrịa ahụ dịka o kwuru na e dugara nwaanyị ahụ ụlọọgwụ.

Ozi ahụ kwuru na nwaanyị a egosighi njirimaara ọrụ ahụ ruo ụbọchị 7 Ọktoba, n'ime ụbọchị anọ ọ batara na Nigeria, nke mere o jiri gawa n'ụlọọgwụ dị n'Abuja n'ụbọchị 11 Ọktoba.

Nyocha e mere n'ahụ ya gosiri na o bụ ụdịrị Ebola a kpọrọ 'Bundibugyo virus'. A na-eme nnyocha ebe o si bute ọrịa Ebola ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na e dosaala nwaanyị ahụ iche ugbua iji gbochie mfesa ọrị ahụ.

Mịnịstrị ahụike na ụlọọrụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) kwuru na ha na ụlọọrụ ahụike FCT Health Services Secretariat nakwa ụlọọrụ ndị ọzọ amalitela ịrụkọ ọrụ iji gbochie ọrịa ahụ ifesa.

Ali Pate kwukwara na Onyeisiala Bola Tinubu enyela ntụziaka ka amalitela atụmatụ igbochi mfesa ọrịa Ebola ahụ na Nigeria.

Gọọmenti Nigeria kpọrọ oku ka ndị ọrụ ahụike nakwa ụlọọgwụ na Nigeria niile gbaa gburugburu kee nkwụcha iji hụ na ha chọpụtara ma machie onye ọbụla gosiri njirimara ọrịa ebola.

Nke a na-abịa dịka mba Kenya wepụtara ozi ma kwuo na otu onye ọzọ ebutela ọrịa ahụ dịka otu onye ji ego achụ ego butere ọrịa ahụ nwụrụ oge o mere njem gaa mba DR Congo.

Kedụ ụdịrị Ebola a kpọrọ Bundibugyo?

Ndị ọrụ ahụike yichiri ahụ na-elete ndị bu ọrịa Ebola

Bundibugyo Ebola bụ ụdịrị Ebola dị ụkọ ma na-akpa ike nke nje a kpọrọ Bundibugyo na-ebute. Ọ na-efesasị site na mmekọ ahụ ọbara onye bu ọrịa a, mmiri ahụ nakwa mmetụ aka n'ihe ọbụla nwere nje ahụ.

Njirimaara

• Na mbido: Oke oyi, oke isiọwụwa, akwara mgbu, ọnya akpịrị nakwa nnukwu ike ọgwụgwụ.

• Ma ọkawanye njọ: Ịgbọ agbọ, nnukwu afọ ọsịsa na ọnyụnyụ, afọ mgbu, akụrụngwa ahụ arụghị ọrụ, ịgba ọbara n'ime ahụ maọbụ site n'ohere ahụ.

• Oge o ji amụbanye: Malite n'ụbọhị abụọ ruo ụbọchị 21 onye ahụ nwere mmekọ ahụ; ọ naghị efe efe ruo mgbe njirimaara ya pụtara ihe.

Mgbochi na ọgwụgwọ ya

• Ọgwụgwọ: O nweghi ọgwụ ọbụla gbapụtara ihe kpọmkwem maka nje Bundibugyo.

• Nlekọta: Ịmalite n'oge na-elekọta onye nwe nje a - gụnyere ịgbanye mmiri n'ahụ ya, nlekọta akụrụngwa 'electrolyte', na nnyocha njirimaara na-enye nnukwu aka iji gbakee..

• Nchekwa: Idopụ onye nwee nje a iche, ichekwa mfesasị nje a, ịchọpụta ndị ha na onye ahụ nwere mmekọ, nakwa ili ozu ọrịa ahụ gburu n'usoro dị mma.

Kedụ ka ọrịa Ebola si efesa?

Ebola na-efesa ma ọ bụrụ na ọbara maọbụ mmiri si n'ahụ onye bu ọrịa malitegoro ịrịa ọrịa a metu onye ọzọ nakwa site n'imetu ihe ọbụla onye bu ọrịa a metụrụ aka.

Onye bu ọrịa Ebola enweghịike ifesa ọrịa ma ọ bụrụ na njirimara amalitebeghị igosi.

Gọọmenti kpọrọ oku ka onye ọbụla kee nkwọcha ma ghara ịtụ egwu.

Ha gwara ọhanaeze ka ha kwụọ aka ha nke ọma ma ghara imetu mmiri si n'ahụ onye ọbụla a na-enyo enyo na ọ bụ ọrịa ebola.

Njirimara ọrịa Ebola gụnyere oke ahụ ọkụ, ike ọgwụọgwụ, isi ọwụwa, ịgbọ agbọ, nakwa afọ ọsịsa.

Ọ bụrụ na ịhụta njirimara ndị a n'ahụ gị, ọ dị mkpa ka ị gaa ụlọọgwụ ka e nyochaa gị.

Ozi ahụ kpọrọ oku ka onye ọbụla ghara ifesa ozi ụgha banyere ọrịa Ebola.