Iwu Nigeria kwadoro ka m zọọ ọkwa ọchịchị na Lagos East na-agbanyeghi ebe m si - Blessing Maduka

Aha onyonyo, Iwu Nigeria kwadoro ka m ịzọ ọkwa ọchịchị na Lagos East na-agbanyeghi ebe m si - Blessing Maduka
Iwu Nigeria kwadoro ka m zọọ ọkwa ọchịchị na Lagos East na-agbanyeghi ebe m si - Blessing Maduka
Mgbe e biputara ya

Nwada Blessing Maduka na-azọ ịnọchiteanya mpaghara Lagos East n'ụlọomeiwu Nigeria gwara BBC ihe mere o jiri banye n'ọgbọ ahụ.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC nwere, Blessing kwuru na ngala iwu Nigeria nke afọ 1999 nyere ya ikike ịzọ ọkwa ebe ọbụla na Nigeria na-agbanyeghi mpaghara o si.

Blessing bụ onye ji aha Accord Party na-azọ ọkwa kwuru na nwoke anaghị amatacha nsogbu dịịrị nwaanyị nke o jiri azọ ọkwa Senate ka o nweeike ịhụ na ọ nọchitere anya ụmụnwaanyị ọfụma.

Gere ụfọdụ ihe ndị o kwuru;

"N’akwụkwo iwu Nigeria nke e megharịrị n’afọ 1999, Mpaghara 65 na 66 emeghị ka m bụrụ onye na-etozughị oke ịzọ ọkwa a.

"Ọ bụghị na mụ na ndị nwe ala na-ama aka. Mụ na ha bụ otu. Ebe a ka m malitere ndọrọndọrọ ọchịchị. Ebe a ka m malitere ime ihe n’ụzọ ndọrọndọrọ ọchịchị. Ebe a ka m mụrụ ụmụ m atọ.

"O nweghị ka nwoke ga-esi ghọtachaa nwaanyị nke ọma. Anyị kachasị nwee ụmụnwaanyị na Nigeria, anyị abịazie na-enwe ụmụnwoke 105 na-enwe mkpebi ga-emetụta ụmụnwaanyị niile.

"Ụmụnwaanyị bụ ndị nchịkọta ezinaụlọ, ndị nchịkọta ụmụaka na ndị nchịkọta ụlọ. Ya mere, anyị kwesịrị ịga ebe ahụ iji nweeike gbanwee ọnọdụ.

"Ịbanye n’Ụlọomeiwu Sịnetị ga-enye m ohere ịnọchiteanya ụmụnwaanyị na ndị ntoroọbịa".