NDC Campaign Council: Ihe mere 'OK Movement' ji agbagha ndị aha ha dị na otu achụmntavootu nke otu NDC

Peter Obi na Rabiu Kwankwaso
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu 'Obi-Kwankwaso Movement (OK Movement) akatọọla ndị otu pati 'Nigeria Democratic Congress' (NDC) họpụtara maka achụmtanvootu maka Ntuliaka 2027, na-ekwu na nhọpụta ahụ na-egosi na ha adịbeghị njikere maka ntuliaka na-abịa.

Onyeisi ndị OK Movement bụ John Ughulu, rụtụrụ aka na NDC egbuola oge ịhazi atụmatụ achumtavootu pati ahụ, ma dọọ aka na ntị na ọchịchọ ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị abụghị ihe ga-eweta mmeri ma ọ bụrụ na e nweghị ezi nhazi na mkpali ndị na-akwado otu NDC n'obodo niile.

N'ozi O weputara na Mọnde, Ughulu kwuru na OK Movement arụchaala ọrụ nhazi dị mkpa, ebe ndị ọzọ ka na-amalite ịhazi nke ha. O kwukwara na ụfọdụ ndị a họpụtara n'otu mgbasa ozi NDC nwere ike mechaa chọọ enyemaka n'aka OK Movement.

O kwuru, sị: "Ihe na-atọ ọchị na ndepụta a bụ na pasentị 90 nke ndị nọ na ya ka ga-abịa rịọ OK Movement ka o nye ha ntọala nhazi na nkwado, ihe ha onwe ha na-enweghị n'aka."

*Esemokwu dị n'etiti NDC na OK Movement*

Nkatọ a bịara n'oge esemokwu dị n'etiti NDC na OK Movement na-akawanye njọ. Esemokwu a dabeere na nnwere onwe, nakwa ọrụ ha ga-arụ n'ịkwado ndị NDC họpụtara maka ịzọ ọkwa onyeisiala, Peter Obi, na osote ya bụ Rabiu Kwankwaso.

Aha ndị NDC họpụtara maka achụmntavootu maka ntuliaka 2027

Seriake Dicson

N'Ụbọchịụka, otu NDC họpụtara onye ndu pati ahụ bụ Seriake Dickson dịka onyeisi otu achụmntavootu pati ahụ, ebe Obi ka bụ osote ya.

Onyeisi NDC bụ Cleopas Moses Zuwoghe, ghọrọ osote onyeisi, ebe Kwankwaso bụ osote onyeisi nke abụọ.

Ndị ọzọ a họpụtara gụnyere onye bụbu odeakwụkwọ Gọọmenti Etiti bụ Babachir Lawal; onye bụbu Osote Onyeisi Ụlọomeịwu bụ Ovie Omo-Agege; onye bụbu onye zọọrọ ọkwa onyeisiala bụ Pat Utomi; na onye bụbu odeakwụkwọ 'Congress for Progressive Change' bụ Buba Galadima.

Peter Obi

A họpụtara odeakwụkwọ nke NDC bụ Ikenna Enekweizu, ka ọ bụrụ odeakwụkwọ otu achụmntavootui ahụ.

E tinyeghị Ughulu na ndị nhazi otu 'OK Movement' na steeti nakwa ọchịchị ime obodo na ngalaba ntuliaka na nhọpụta ahụ NDC nke mere kpaliri esemokwu banyere mkpebi 'OK Movement' imepụta otu nke ha maka ndị na-azọ ọkwa onyeisiala.

Mwepụ a wepụrụ Ughulu na ndị nhazi otu 'OK Movement' n'ọkwa steeti, ọchịchị ime obodo, na ngalaba ntuliaka n'ime nhọpụta ọhụrụ NDC kpaliri esemokwu, nke mere ka ha kpebie ịhazi òtù mgbasa ozi nke ha.

Onye ndu pati NDC bụ Dickson, katọrọ mkpebi ahụ dịka ihe na-enweghị isi na ọdụ.

O kwuru na otu ndị na-akwado ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kwesịrị ịkwado pati ha, kama ịma ha aka n'ihu maọbụ imepụta usoro nhazi yiri nke ha.