Ihe Ejike Asiegbu, Desmond Elliot, Mercy Johnson na ndị Nollywood ndị ọzọ kwuru maka ọnwụ Francis Duru

Francisi Duru
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị ihe ejije Nollywood na ndị ihe Francis Duru na-amasị na-atụ arịrị onwụ maka ọnwụ onye ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Francis Duru.

Francis Duru, onye e ji 'Ahanna' mara n'ihi agwa o mere n'ihe ejije 'Rattle Snake' nke ya na Nkem Owoh, Ann Njemanze, Ernest Obi na ndị ọzọ soro mee, nwurụ ka ọ gbachara afọ 57.

Kemgbe ezinaụlọ ya mara ọkwa ọnwụ ya n'ụzọ ụtụtụ Fraide, ọtụtụ ndị mmadụ ihe ya na-amasị na Nigeria nakwa Africa, gụnyere ndị ogbo ya na-eru ụjụ maka ọnwụ ya.

Ọnwụ ya na-abịa afọ abụọ nwa ya nwoke nwụchara tiwara ọtụtụ obi.

Otu n'ime ha bụ Ejike Asiegbu kwuru n'ozi o wepụtara n'ọbaozi Thread sị, "Ụwa enweghị isi. Otu nkeji ị nọ ebe, nkeji ọzọ, ị laala."

Ogbo ya ọzọ bụ Desmond Eliot, onye bụbụ onye omeiwu n'Ụlọmeiwu Nke Lagos State kwuru na ọnwụ Duru dị mwute ma tie, "Ezi onye ihe ejijie alaa."

Emeka Enyiocha, Mercy Johnson-OKojie na Desmond Elliot

Mercy Johnson kwuru na ọnwụ ahụ "riri ya ọnụ".

Emeka Enyiocha kwuru ya na, 'Ọ gbagwojuru ya anya."

"Anyị niile ga-abịa zute gị mana ekpere anyị bụ ka ọnwụ bịa oge anyị kara nka, oge anyị enwezighị ihe anyị na-arụ n'ụwa."

Onye nkiri Nollywood Francis Duru anwụọla ka ọ gbachara afọ 57

Francis duru yi uwe ọdịnala nwere agwa ele ma kpuru okpu na-acha mme mme

Onye ome ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Francis Duru anwụọla dịka ọ rịachara obere ọrịa.

Nke a dị n'ozi ezinaụlọ ya wepụtara n'akara Instagram ya @francisduru n'isi ụtụtụ Fraịde 23 Ọktoba 2026, bụ ebe ha wepụtara ọnwụ ya.

N'ozi ahụ ha kwuru "Anyị bụ ndị ezinaụlọ Francis Duru, ji nwute na-ekwupụta ọnwụ ya dịka ọ rịachara obere ọrịa.

"Anyị na-ekele gị maka ekpere unu, ịhụnanya nakwa nghọta.

Ka mkpụrụobi ya laa n'udo. Amen."

Francis Duru dị afọ iri ise na asaa (57yrs) tupuu ọ nwụọ.

Ọtụtụ ndị otu ya n'ime ihe ejije amalitela idepụta nwute ha banyere ọnwụ ya nakwa ịkọwa ụdịrị ndụ o biri n'ụwa.