Onye bụ ụkochukwu Alakụba Sheikh Yahya Masussuka ndị ojiegbe gbagburu na Katsina state?

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị uweojii na Katsina state ekwuola na ndị ojiegbe agbagbuola Sheikh Yahya Masussuka bụ ụkọchukwu okpukperechi Alakụba n'obodo ya dị na Dutsen-Ma.

Onyeisi ndị uweojii na Dutsen-Ma bụ Auwalu Gwadabe gwara BBC na ndị ojiegbe ahụ wakporo ma gbuo ụkọchukwu ahụ n'abalị Mọnde 26 Ọktoba 2026 n'ihu ụlọ ya.

Odeakwụkwọ Sheikh Masussuka bụ Musapha Haruna kwuru na Sheikh Yahya Masussuka nwụrụ n'ụlọọgwụ dị na Dutsen-Ma ebe e bugara iji zọọ ya ndụ.

A ma Masussuka dịka onye Ụkọchụkwu Alakụba na-akpo oku ka udo chịa n'etiti ndị Ụka Alakụba na ndị Ụka Kraịstị.

Onye ụkọchukwu ọzọ a ma ama bụ Sheikh Usman Dangungu kwuru na ọnwụ Sheikh Masussuka dị oke mwute ma kwuo na ha ga-enye ohere ka e mee nnyocha iji chọpụta ma nwụchie ndị ojiegbe ahụ gburu ya.

Sheikh Yahya Masussuka bụ otu n'ime ndị ụkọchukwu Alakụba nkụzi ya na-akpali nrụrịtaụka na mpaghara Ugwu Awusa nakwa mba ndị ọzọ gbara ya gburugburu.

Ọtụtụ ndị nkụzi okpukperechi Alakụba na-akatọ nkụzi ya ma kwuo na ọ naghị anabata nkụzi Onye Amụma Muhammad.

Ọ bụ nke a mere gọọmenti Katsina state jiri kpọọ Sheikh Yahya Masussuka oku ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo ịkpagbu ndị nkụzi Alakụba nakwa imetọ nkụzi onye amụma Muhammad.

Etu Sheikh Yahya Masussuka si nwụọ

Akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Katsina state bụ DSP Abubakar Aliyu wepụtara, kwuru na e gburu Sheikh Masussuka n'ihu ụlọ ya dị n'okpuru ọchịchị Dutsen-Ma, Katsina state oge o ji ụkara gafee elekere asaa nke mgbede n'ụbọchị Mọnde 26 Ọktoba, 2026.

Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na ndị ojiegbe ahụ gburu Sheikh Masussuka na enyi yan woke bụ Adamu Abubakar.

Odeakwụkwọ Sheikh Masussuka kwuru na ọ bụ oge ya na enyi ahụ chọrọ ịga ebe ọ na-anọ agụ akwụkwọ ka njinji ahụ jiri.

Ndị uweojii kwuru na e bugara Sheikh Masussuka na enyi ahụ n'ụlọọgwụ mana ọ bụ ebe ahụ ka ndị dọkịnta nọ kwuo na ha anwụọla.

Kọmishọna ndị uweojii na Katsina state enyela iwu ka a malite nnyocha zuruoke iji chọpụta ma nwụchie ndị ojiegbe kpara ajọ agwa a.

N'aka nke ọzọ, otu Amnesty International akatọọla ogbugbu e gburu Sheikh Yahaya Masussuka.

Ozi Amnesty International wepụtara n'akara X ha kpọrọ oku ka gọọmenti mee nnyocha zuruoke iji chọpụta ma nwụchie ndị ojiegbe ahụ gburu ya na enyi ya nwoke.

Mana onye bụ Sheikh Yahya Masussuka?

A mụrụ Sheikh Yahya Masussuka n'ọnwa Septemba 19, 1979 n'obodo Biyawa dịbu n'okpuru ọchịchị Batsari tupu a gbanwee ya ka ọ bụrụ okpuru ọchịchị Dutsinma na Katsina state.

Ọ bụ onye nkụzi okpukperechi Alakụba a ma ama. Ọ malitere ikụzi maka okpukperechi Alakụba oge ọ dị afọ 13.

Ọ lụrụ nwaanyị abụọ, mụọ ụmụaka asaa.

Sheikh Yahya Masussuka gụrụ akwụkwọ n'ebe dị iche iche nke gụnyere Al-Azhar University dị na mba Egypt nakwa Oman.

Ndị kuziere ya gụnyere Sheikh Alhassan Lamido na Sheikh Malam Usman Dangungu nke Kaduna state.

E nwere oge a tụrụ mkpọrọ ọnwa itoolu na Katsina state maka ebubo banyere nkụzi ya.

Sheikh Yahya Masussuka bụ bụ onye ụkọchukwu Alakụba, onye nkụzi nakwa onye na-akpọ oku udo bi na Dutsin-Ma dị na Katsina state, Nigeria.

N'agbanyeghị na ọ bụ onye Bauchi state, o hiwere onwe dịka onye a ma ama na nkụzi Alakụba na mpaghara ugwu Nigeria.

Ọ na-akụzi 'Tafseerul Qur'ani bil Qur'an' nke a bụ usoro e ji enwere ihe dị n'akwụkwọ Qur'an akọwa ihe ndị ọzọ dị n'ime ya.

Sheikh Yahya Masussuka bụ onye nkụzi ya na-atụle ụfọdụ omenala Hadith. Nkụzi bụ nke na-ebute esemokwu n'etiti ya na ndị nkụzi okpkperechi Alakụba ndị ọzọ.

Sheikh Yahya Masussuka bụ onye na-akpọ oku ịdị n'otu n'etiti ndị okpukperechi Alakụba na ndị ụka Kraịst.

Network for Good Governance and Transparency nyere ya onyinye Peace Ambassador Award n'ọnwa Juun 2025 maka mbọ ọ na-agba n'obodo ya.

Sheikh Yahya Masussuka nwetakwara ọtụtụ nkatọ nakwa mkparị na soshal midịa maka nkụzi ya.