Inec amalitela inyocha foto a na-enyo na e ji akụrụngwa AI rụọ na ndekọ aha ndị ga-atụ vootu

Ụlọọrụ Inec kwuru na ya ebidola imezi ihe ndị ahụ ha chọpụtara dịka usoro iwu si dị.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Nigeria bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ekwuola na ha amalitela inyocha foto ndị dị n'ime ndekọ aha ndị ga-esonye n'ịtụ vootu na ntuliaka na-abịa n'afọ 2027

O kwuru na foto ndị ahụ bụ nke ụlọọrụ ahụ bipụtara na weebụsaịtị ha, bụ ndị a na-enyo enyo na ọ bụ akụrụngwa AI ka e jiri rụpụta ha.

Inec kwuru na oge a na-egosipụta ndekọ ndị debanyere aha n'akwụkwọ ndị ga-atụ vootu n'ihu ọha n'ebe dị iche iche na mba ahụ ka ha chọpụtara ma kwupụta ndekọ ndị na-enyo enyo.

Ọ gbakwụnyere na e bidola imezi ihe ndị ahụ dịka usoro iwu si dị.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Mohammed Kudu Haruna wepụtara n'abalị Tuzde 27 Ọktoba 2026, ka ụlọọrụ ahụ mere ka o doo anya na ndekọ ahụ e tinyere na weebụsaịtị ha n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba bụ otu ndekọ mbụ ahụ ha gosiri n'ihu ọha site na Ọktoba 9 ruo 15.

Ọ gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ ahụ malitere usoro inyocha ndekọ ndị a na ime ihe mmezi kwesịrị ekwesị banyere mkpesa ndị mmadụ kwupụtara oge ahụ, dịka usoro ndị e guzobere si dị.

INEC Voters' Register: Nke na-akpọtụ ka e wepụtara ndekọ ndị ga-atụ vootu na 2027

Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Joash Ojo Amupitan, SAN na ọka mmụta Pat Utomi
Nkọwa foto, Joash Ojo Amupitan na Pat Utomi

Ụfọdụ ụmụamaala Nigeria eboola ebubo na akwụkwọ ndekọ aha nke ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Nigeria bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) wepụtara na nsonso a nwere arụrụmarụ Bekee kpọro AI, ụfọdụ ahụghị aha ha, ebe ụfọdụ nwere aha ha ụzọ abụọ.

Ụbọchị Monde, abalị 26 nke ọnwa Oktoba, afọ 2026, Inec wepụtara akwụkwọ ndebanye aha maka ntuliaka mbụ ya n'ịntanet dịka ha wepụtachara nke a hụrụ anya n'ụlọọrụ ha.

Mana kemgbe ebubo ahụ fegharịwara na soshal midia, Inec asabeghị okwu kpọmkwem metụta ebubo ahụ.

Otu n'ime ndị na-agba Inec ụkwụ maka ọnọdụ akwụkwọ ndebanye aha bụ Ọkammụta Pat Utomi kwurụ na ụlọọrụ INEC ekwesịghị iji ntụkwasaobi na usoro ntuliaka gwu egwu.

Pat Utomi

Pat Utomi, onye kwuru nke a n'akara ya n'ọbaozi X kwuru sị," Na a hụrụ foto ndị mmadụ e jiri Ai rụọ na ndekọ ndị ga-atụ vootu na 2027 na-akpalite ajụjụ maka eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ na ntuliaka."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Akụkọ na-efegharị na-ebo ebubo na aha ụfọdụ dị n'akwụkwọ ndekọ ndị ga-atụ vootu nwere foto arụrụ arụ AI, ụfọdụ bụ aha ndị nwụrụ anwụ, ebe ụfọdụ ahụghị aha ha.

'Gịnị ka Foto mmadụ Ai na-eme na ndekọ INEC?'

Otu onye nọ n'ọbaozi X kpọrọ onwe @ELeniyan of CVe) ya kwuru na ya debanyere aha ya n'ọnwa Mee/Juun, afọ 2026 mana aha ya adịghị n'akwụkwọ ndekọ ahụ Inec.

Nwoke ahụ onye nke tinyere akwụkwọ ndebanye aha bu 'Ekejiuba Ekechukwu'

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Anyị ga-enyocha ebubo ndị ahụ- INEC

Ọkammụta Joash Amupitan

N' ọsịsa n'ebubo ndị mmadụ na-ebo na-ekwu na ha hụrụ Foto Ai dị na ndekọ ndị ga-atụ vootu ha bipụtara, Inec kwuru na ha ga-enyocha ebubo ndị ahụ.

Ọnụ na-ekwuru Inec bụ Mohammed Kudu Haruna,gwara BBC Igbo n'ekwentị sị, "Ọ bụ n' abalị gara aga ka anyị bipụtara ndekọ ndị ga-atụ vootu n'online".

"Maka ndị na-ekwu na ha hụrụ Ai, m ga-ejekwuru ndị nọ na ngalaba nka na ụzụ ma gwa ha ihe I kwuru".

"Nke mbụ bụ na anyị ga-achọpụta na ọ bụ eziokwu na foto Ai dị na ndekọ anyị, ọzọ bụ na ha ga-agwa m etu nke ahụ si mee tupu m abịa kọwara unu ihe m chọpụtara."

INEC kwuburu n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahu bụ Mohammed Kudu Haruna binyere aka na ha wepụtara ndekọ aha n'intanet n'ihi ọchịchọ nke ndị mmadụ.

"Anyị ahụla ihe niile ndị mmadụ ne-ekwu ma ndị ọnụ na-eru n'okwu banyere ime ka onye ọbụla nwee ike ịhụ ihe dị na ndekọ ndị ga-atụ vootu n'akara website anyị n'ịnatnet."

"Ọ bụ nke a ka anyị ji eme ka onye ọbụla new ohere ị ga na webụsaitị anyị ka ha hu aha ndị ga-atụ vootu".