Archdiocese New York ekwetala ịkwụ mmadụ 1,300 nde dọla 800 maka mmetọ mmekọahụ

Ebe foto si, Getty Images
Archdiocese nke New York ekwetala ịkwụ ihe karịrị nde dọla 800 iji dozie mkpesa iwu nke ihe dị ka mmadụ 1,300 ndị ụkọchukwu metọrọ n'ụzọ mmekọahụ.
Archbishop Ronald Hicks nke New York kwuru na Satọde na a ga-abinyeaka n'akwụkwọ nkwekọrịta a n'abalị iri isii na isii n'ọnwa Nọvemba, mgbe ya na ndị gbara akwụkwọ n'ụlọikpe na ndị ọka iwu ha kwekọrịtachara.
O dere n'ozi o zigara ndị ụkọchukwu ya, nke ụlọọrụ mgbasa ozi Archdiocese kesakwara, sị: "Anyị nọ nso imezu ihe ga-eme ka anyị, site n'amara Chineke, wetara ndị niile e metọrọ n'ụzọ mmekọahụ ụfọdụ ahụ iru ala, ọgwụgwọ obi na imekọrịta ọzọ."
Ọ gbakwụnyere, sị: "Nkwekọrịta a ga-emekwa ka Archdiocese nwee ike ilekwasị anya ọzọ n'ozi ya zuru oke, nke bụ ikwusa oziọma, ịgwọ ndị ọrịa, ilekọta ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, ịnabata ndị bịara ọhụrụ, na ịkụziri ụmụ anyị ihe."
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara ndị otu Kraịst
Dịka akwụkwọ akụkọ 'The New York Times,' nke bu ụzọ kọọ akụkọ a si kwuo, onye ọ bụla n'ime ihe dịka mmadụ 1,300 ahụ ga-enweta opekatampe puku dọla 250 site n'aka Archdiocese nke New York. Ha nwekwara ike inweta ego karịrị nke a, dabere n'ogo mmegbu ha tara.
Nkwekọrịta a bụ nke abụọ kacha ukwuu n'ụdị ya, ka emechara nke Archdiocese nke Los Angeles kwetara ịkwụ nde dọla 880 n'afọ 2024.
Jeff Anderson, onye ọkaiwu na-anọchiteanya ndị tinyere ihe karịrị mkpesa iwu 1,000 megide ụka Katọlik na New York, kwuru n'ozi o wepụtara, sị:
"Eziokwu ahụ bụ na ndị niile gbara akwụkwọ megide Archdiocese nke New York kwetara n'otu olu na-egosi oge dị mkpa n'ọchịchọ ha na-achọ ikpe ziri ezi."
Ọ gara n'ihu kwuo, sị:
"Site n'obi ike ha, aja ha chụrụ na mkpebi siri ike ha, ndị gbanarịrị mmegbu a enyerela aka ime ka a malite ịza ajụjụ banyere ihe mere, nakwa ime nnukwu nzọụkwụ n'ịhụ na ndị kpatara mmegbu a ga-aza ajụjụ."
Asịrị na mmezi ikpe

Ebe foto si, Getty Images
Nkwekọrịta a bụ njedebe nke ọtụtụ afọ a nọrọ na mkparịtaụka n'etiti ndị ọkaiwu na-anọchiteanya ndị gbara akwụkwọ. Nke a mere n'oge ụka Katọlik dị na America ka nọ na nsogbu asịrị metụtara mmegbu n'ụzọ mmekọahụ kemgbe mmalite afọ 2000.
N'afọ ndị 2000, nnyocha ndị ụlọọrụ mgbasaozi mere kpughere na ndị ụkọchukwu Katọlik nọ n'America metọrọ ọtụtụ puku ụmụaka n'ụzọ mmekọahụ n'ime ọtụtụ iri afọ.
Nchọpụta ndị ahụ gosikwara na ndị isi ụka na-ekpuchikarị okwu ndị a, maọbụ na-ebuga ndị ụkọchukwu ahụ mere mmejọ a n'ebe ọzọ kama ịkọrọ ndị ọchịchị obodo ihe merenụ.
Diocese dị iche iche n'ofe mba ahụ aghaghị ịkwụ ọtụtụ narị nde dọla dịka ụgwọ mmebi. E mekwara mmemme iji kwụọ ndị gbanarịrị mmegbu ụgwọ, n'enweghị mkpa ịga ụlọikpe maka ya.
N'ọnwa Juun, Archdiocese nke San Francisco kwupụtara na ya ekwetala ịkwụ nde dọla 395 nye ihe dịka mmadụ 530 ndị ụkọchukwu ya metọrọ n'ụzọ mmekọahụ, iji dozie ikpe ha gbara n'ụlọikpe.































